Native Bible

Leviticus 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye nchụaja nke chụrụ aja nsure ọkụ nʼisi onye ọbụla, ka ọ dịrị iwere akpụkpọ niile si nʼanụ ahụ o ji chụọ aja nye onwe ya.

Leviticus 7:8 in English

Leviticus 7:8 · Berean Standard Bible

As for the priest who presents a burnt offering for anyone, the hide of that offering belongs to him.

Context

6Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ fọdụrụ na ya, maọbụ nʼebe nsọ ka aghaghị ịnọ rie ya. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 7“ ‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ. 8Onye nchụaja nke chụrụ aja nsure ọkụ nʼisi onye ọbụla, ka ọ dịrị iwere akpụkpọ niile si nʼanụ ahụ o ji chụọ aja nye onwe ya. 9A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ. 10Aja mkpụrụ ọka ọbụla, ma nke e tinyere mmanụ, ma nke a na-etinyeghị mmanụ, nke fọdụrụ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.