Levitikọs 7:14
Leviticus 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja.
Leviticus 7:14 in English
Leviticus 7:14 · Berean Standard Bible
From the cakes he must present one portion of each offering as a contribution to the LORD. It belongs to the priest who sprinkles the blood of the peace offering.
Context
12“ ‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya. 13Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha. 14Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja. 15Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi. 16“ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.