Native Bible

Leviticus 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”

Leviticus 6:7 in English

Leviticus 6:7 · Berean Standard Bible

In this way the priest will make atonement for him before the LORD, and he will be forgiven for anything he may have done to incur guilt.”

Context

5maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise* nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya. 6Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie. 7Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.” 8Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 9“Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.