Levitikọs 6:28
Leviticus 6:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.
Leviticus 6:28 in English
Leviticus 6:28 · Berean Standard Bible
The clay pot in which the sin offering is boiled must be broken; if it is boiled in a bronze pot, the pot must be scoured and rinsed with water.
Context
26Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya. 27Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ. 28A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha. 29Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 30Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.
6:5 Ọnụ 5:7
6:16 Lev 2:3
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.