Native Bible

Leviticus 6:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.

Leviticus 6:17 in English

Leviticus 6:17 · Berean Standard Bible

It must not be baked with leaven; I have assigned it as their portion of My offerings made by fire. It is most holy, like the sin offering and the guilt offering.

Context

15Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma. 16*Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya. 17Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie. 18Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’ ” 19Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.