Native Bible

Leviticus 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-ewepụ abụba niile site nʼoke ehi aja mmehie, abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na nke jikọtara ha,

Leviticus 4:8 in English

Leviticus 4:8 · Berean Standard Bible

Then he shall remove all the fat from the bull of the sin offering—the fat that covers the entrails, all the fat that is on them,

Context

6Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ, fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi nke ebe nsọ ahụ. 7Onye nchụaja ga-etekwasị ụfọdụ ọbara ahụ na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, nʼihu Onyenwe anyị nʼime ụlọ nzute. Ọbara fọdụrụ nʼoke ehi ahụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ, nʼọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute. 8Ọ ga-ewepụ abụba niile site nʼoke ehi aja mmehie, abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na nke jikọtara ha, 9na akụrụ ya abụọ na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya, 10dịka e si ewepụ abụba oke ehi e ji chụọ aja udo. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.