Levitikọs 4:35
Leviticus 4:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ewepụ abụba ya niile, dịka a na-eme nʼatụrụ aja udo. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie nʼihi iwu ha dara. A ga-agbaghara ha mmehie ha. 4:15 Lev 8:14,22; Ọnụ 8:8-10 4:25 Lev 9:9
Leviticus 4:35 in English
Leviticus 4:35 · Berean Standard Bible
And he shall remove all the fat, just as the fat of the lamb is removed from the peace offerings, and he shall burn it on the altar along with the offerings made by fire to the LORD. In this way the priest will make atonement for him for the sin he has committed, and he will be forgiven.
Context
33Ọ ga-eweta ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ebikwasị ya aka nʼisi, gbuo ya nʼebe ahụ, ka ọ bụrụ aja mmehie ya. 34Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara anụ aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya, tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja. 35Ha ga-ewepụ abụba ya niile, dịka a na-eme nʼatụrụ aja udo. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie nʼihi iwu ha dara. A ga-agbaghara ha mmehie ha.
4:15 Lev 8:14,22; Ọnụ 8:8-10
4:25 Lev 9:9
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.