Native Bible

Leviticus 4:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ eweta otu atụrụ dịka onyinye nʼihi aja mmehie ya, ọ ghaghị ịbụ nne atụrụ na-enweghị ntụpọ.

Leviticus 4:32 in English

Leviticus 4:32 · Berean Standard Bible

If, however, he brings a lamb as a sin offering, he must bring an unblemished female.

Context

30Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara ahụ na mkpịsịaka ya tee ya na mpi nke ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. 31Ọ ga-ewepụ abụba ya niile dịka a na-eme nʼaja udo. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja, dịka ihe na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja a ga-ekpuchikwara ha mmehie. A ga-agbagharakwa ha. 32“ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ eweta otu atụrụ dịka onyinye nʼihi aja mmehie ya, ọ ghaghị ịbụ nne atụrụ na-enweghị ntụpọ. 33Ọ ga-eweta ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ebikwasị ya aka nʼisi, gbuo ya nʼebe ahụ, ka ọ bụrụ aja mmehie ya. 34Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara anụ aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya, tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.