Native Bible

Leviticus 4:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼelu isi aja mmehie ahụ, e gbuo ya nʼebe a na-achụ aja nsure ọkụ.

Leviticus 4:29 in English

Leviticus 4:29 · Berean Standard Bible

He is to lay his hand on the head of the sin offering and slaughter it at the place of the burnt offering.

Context

27“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha, 28ọ bụrụkwa na-amata mmehie ha mere, ha ga-eweta nne ewu na-enweghị ntụpọ dịka onyinye nʼihi mmehie ya. 29Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼelu isi aja mmehie ahụ, e gbuo ya nʼebe a na-achụ aja nsure ọkụ. 30Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara ahụ na mkpịsịaka ya tee ya na mpi nke ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. 31Ọ ga-ewepụ abụba ya niile dịka a na-eme nʼaja udo. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja, dịka ihe na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja a ga-ekpuchikwara ha mmehie. A ga-agbagharakwa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.