Levitikọs 4:25
Leviticus 4:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya tee ya nʼelu mpi ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ.* Nke fọdụrụ ka ọ ga-awụpụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
Leviticus 4:25 in English
Leviticus 4:25 · Berean Standard Bible
Then the priest is to take some of the blood of the sin offering with his finger, put it on the horns of the altar of burnt offering, and pour out the rest of the blood at the base of the altar.
Context
23Ọ bụrụkwa na-eme ka ọ mata mmehie ya, ọ ghaghị iweta mkpi na-enweghị nkwarụ dịka onyinye nʼihi mmehie ya. 24Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi mkpi ahụ. Gbuo ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ aja mmehie. 25Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya tee ya nʼelu mpi ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ.* Nke fọdụrụ ka ọ ga-awụpụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. 26Ọ ga-akpọ abụba ya niile ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka o si kpọọ abụba anụ e ji chụọ aja udo ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri onyeisi ahụ mmehie ya. A ga-agbaghara ya. 27“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.