Native Bible

Leviticus 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.

Leviticus 3:13 in English

Leviticus 3:13 · Berean Standard Bible

He must lay his hand on its head and slaughter it in front of the Tent of Meeting. Then Aaron’s sons shall sprinkle its blood on all sides of the altar.

Context

11Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. 12“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu Onyenwe anyị, 13ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja. 14Ọ bụ site nʼonyinye nke i wetara ka ị ga-esi chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na abụba niile metụtara ha, 15na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.