Levitikọs 26:34
Leviticus 26:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile.
Leviticus 26:34 in English
Leviticus 26:34 · Berean Standard Bible
Then the land shall enjoy its Sabbaths all the days it lies desolate, while you are in the land of your enemies. At that time the land will rest and enjoy its Sabbaths.
Context
32Aga m eme ka ala unu tọgbọrọ nʼefu, mee ka ọnọdụ ịdị ala unu bụrụ ihe ga-eju ndị iro unu ga-ebi nʼime ya anya. 33Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile. 34Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile. 35Ogologo oge niile ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ala ahụ ga-ezu ike, ụdị izuike ọ na-enweghị nʼafọ izuike ndị ahụ unu bi nʼime ya. 36“ ‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.