Native Bible

Leviticus 26:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.

Leviticus 26:18 in English

Leviticus 26:18 · Berean Standard Bible

And if after all this you will not obey Me, I will proceed to punish you sevenfold for your sins.

Context

16mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha. 17Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu. 18“ ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu. 19Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz. 20Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.