Native Bible

Leviticus 22:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.

Leviticus 22:7 in English

Leviticus 22:7 · Berean Standard Bible

When the sun has set, he will become clean, and then he may eat from the sacred offerings, for they are his food.

Context

5maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya. 6Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ. 7Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya. 8Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu,* nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị. 9“ ‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.