Native Bible

Leviticus 22:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị.

Leviticus 22:3 in English

Leviticus 22:3 · Berean Standard Bible

Tell them that for the generations to come, if any of their descendants in a state of uncleanness approaches the sacred offerings that the Israelites consecrate to the LORD, that person must be cut off from My presence. I am the LORD.

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 2“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị. 3“Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị. 4“ ‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị, 5maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.