Native Bible

Leviticus 22:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ ga-eweta otu oke nke na-enweghị nkwarụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, ka a nabata ya nʼaha.

Leviticus 22:19 in English

Leviticus 22:19 · Berean Standard Bible

must offer an unblemished male from the cattle, sheep, or goats in order for it to be accepted on your behalf.

Context

17Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 18“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu, 19ọ ga-eweta otu oke nke na-enweghị nkwarụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, ka a nabata ya nʼaha. 20Ewebatala ihe ọbụla nke nwere nkwarụ, nʼihi na agaghị m anabata ya nʼaha gị. 21Mgbe onye ọbụla wetara ehi maọbụ atụrụ maọbụ ewu site nʼigwe anụ, dịka onyinye aja udo ọ na-enye Onyenwe anyị maka imezu nkwa, maọbụ onyinye afọ ofufu, ọ ga-abụ nke na-enweghị ọrụsị maọbụ ntụpọ ọbụla tupu a nabata ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.