Native Bible

Leviticus 20:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile.

Leviticus 20:24 in English

Leviticus 20:24 · Berean Standard Bible

But I have told you that you will inherit their land, since I will give it to you as an inheritance—a land flowing with milk and honey. I am the LORD your God, who has set you apart from the peoples.

Context

22“ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu. 23Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi. 24Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile. 25“ ‘Unu aghaghị ịkpa oke nʼetiti anụmanụ ndị dị ọcha iri eri, na anụmanụ ndị na-adịghị ọcha, na nʼetiti anụ ufe dị ọcha iri eri na ndị rụrụ arụ.* Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ maọbụ anụ ufe, maọbụ ihe ọzọ na-akpụgharị nʼala, ndị ahụ m kewapụrụ iche dịka ihe rụrụ arụ. 26Unu ga-adị nsọ nye m, nʼihi na mụ, bụ Onyenwe anyị, dị nsọ. Ekewapụtala m unu, doo unu iche, site nʼetiti ndị mba ọzọ niile, ka unu bụrụ nke m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.