Levitikọs 19:4
Leviticus 19:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
Leviticus 19:4 in English
Leviticus 19:4 · Berean Standard Bible
Do not turn to idols or make for yourselves molten gods. I am the LORD your God.
Context
2“Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ. 3“ ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. 4“ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. 5“ ‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya. 6Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.