Native Bible

Leviticus 18:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.

Leviticus 18:8 in English

Leviticus 18:8 · Berean Standard Bible

You must not have sexual relations with your father’s wife; it would dishonor your father.

Context

6“ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 7“ ‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a. 8“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya. 9“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama. 10“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.