Levitikọs 15:32
Leviticus 15:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a bụ usoro iwu gbasara ndị ikom ihe si nʼahụ ha na-asọpụta, na ndị ikom rụrụ arụ nʼihi mkpụrụ nwa si ha nʼahụ pụọ.
Leviticus 15:32 in English
Leviticus 15:32 · Berean Standard Bible
This is the law of him who has a discharge, of the man who has an emission of semen whereby he is unclean,
Context
30Onye nchụaja ahụ ga-eji otu chụọrọ ya aja mmehie, werekwa nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi adịghị ọcha nke ihe ọsụsọ ya. 31“ ‘Unu ga-ekewapụ ụmụ Izrel site nʼihe ndị ahụ na-emerụ ha, ka ha ghara ịnwụ nʼọnọdụ adịghị ọcha ha nʼihi imerụ ụlọ nzute m, nke dị nʼetiti ha.’ ” 32Ndị a bụ usoro iwu gbasara ndị ikom ihe si nʼahụ ha na-asọpụta, na ndị ikom rụrụ arụ nʼihi mkpụrụ nwa si ha nʼahụ pụọ. 33Ọ bụkwa iwu dịrị nwanyị ọbara si nʼahụ ya pụọ nʼoge a kara aka, na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla ihe si nʼahụ ya na-asọpụta, na nke dịrị nwoke ọbụla ya na nwanyị ga-edinakọ nʼoge nwanyị ahụ bụ onye rụrụ arụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.