Levitikọs 15:20
Leviticus 15:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya nʼoge a, maọbụ ihe ọ nọkwasịrị nʼelu ya ga-arụ arụ.
Leviticus 15:20 in English
Leviticus 15:20 · Berean Standard Bible
Anything on which she lies or sits during her menstruation will be unclean,
Context
18Mgbe nwoke na nwanyị dinakọrọ, ma nwoke ahụ anyụpụta mkpụrụ nwa, ha abụọ ga-asa ahụ ha nke ọma, bụrụ ndị rụrụ arụ ruo uhuruchi. 19“ ‘Mgbe ọbara si nwanyị nʼahụ pụọ dịka o kwesiri nʼoge a kara aka nʼọnwa ọbụla, nwanyị ahụ ga-abụ onye rụrụ arụ ụbọchị asaa. Onye ọbụla metụrụ ya aka nʼoge a ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 20“ ‘Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya nʼoge a, maọbụ ihe ọ nọkwasịrị nʼelu ya ga-arụ arụ. 21Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka, ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 22Onye metụrụ ihe o ji nọdụ ala aka ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.