Levitikọs 15:13
Leviticus 15:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Mgbe e mere ka onye ahụ bụrụ onye dị ọcha site nʼihe nsọpụta a, ọ ga-anọ ụbọchị asaa maka ịdị ọcha ya. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya nʼime mmiri na-asọ asọ tupu ọ bụrụ onye dị ọcha.
Leviticus 15:13 in English
Leviticus 15:13 · Berean Standard Bible
When the man has been cleansed from his discharge, he must count off seven days for his cleansing, wash his clothes, and bathe himself in fresh water,* and he shall be clean.
Context
11“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ahụ rụrụ arụ ebughị ụzọ saa aka ya tupu o metụ mmadụ aka, onye ahụ o metụrụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri. 12“ ‘A ga-etiwa ite aja ọbụla onye ahụ metụrụ aka, jiri mmiri ṅachaa ihe osisi ọbụla o metụrụ aka. 13“ ‘Mgbe e mere ka onye ahụ bụrụ onye dị ọcha site nʼihe nsọpụta a, ọ ga-anọ ụbọchị asaa maka ịdị ọcha ya. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya nʼime mmiri na-asọ asọ tupu ọ bụrụ onye dị ọcha. 14Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ bịa nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, were ha nye onye nchụaja. 15Onye nchụaja ga-eji ha chụọrọ ya aja nʼebe ahụ. Otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ maka aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri nwoke ahụ mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị nʼihi ihe ọsụsọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.