Levitikọs 13:45
Leviticus 13:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onye ọbụla a chọpụtara na ọ bụ onye ekpenta ga-eyi uwe dọkara adọka, hapụ agịrị isi ya ka ọ dịka nke onye ara. Ọ ga-ekpuchi elu egbugbere ọnụ ya, na-eti mkpu na-asị, ‘Onye rụrụ arụ ka m bụ. Onye rụrụ arụ ka m bụ!’
Leviticus 13:45 in English
Leviticus 13:45 · Berean Standard Bible
A diseased person must wear torn clothes and let his hair hang loose,* and he must cover his mouth and cry out, ‘Unclean, unclean!’
Context
43Nʼihi ya, onye nchụaja ga-elezi ya anya. Ọ bụrụ na etuto ahụ toro ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, ọ ga-abụ na ọ ghọọla ọrịa ekpenta. 44Onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye ekpenta. Ọ bụkwa onye rụrụ arụ, nʼihi ọnya ahụ dị ya nʼisi. 45“Onye ọbụla a chọpụtara na ọ bụ onye ekpenta ga-eyi uwe dọkara adọka, hapụ agịrị isi ya ka ọ dịka nke onye ara. Ọ ga-ekpuchi elu egbugbere ọnụ ya, na-eti mkpu na-asị, ‘Onye rụrụ arụ ka m bụ. Onye rụrụ arụ ka m bụ!’ 46Ụbọchị niile nke ọ nọ nʼọrịa ahụ, ọ gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ nʼihi na onye rụrụ arụ ka ọ bụ. 47“Ọ bụrụ na a hụrụ ntụpọ yiri ntụpọ ọrịa na-efe efe nʼuwe ajị anụ maọbụ nʼuwe ogho ọcha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.