Native Bible

Leviticus 13:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị nke asaa onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ abasaghị karịa, ọ bụrụ na o nweghị ajị na-acha edo edo, ọ bụrụkwa na o mibaghị emiba,

Leviticus 13:32 in English

Leviticus 13:32 · Berean Standard Bible

On the seventh day the priest is to reexamine the infection, and if the scaly outbreak has not spread and there is no yellow hair in it, and it does not appear to be deeper than the skin,

Context

30onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ dị ala karịa akpụkpọ ahụ ya, ọ bụrụkwa na ajị dị na ya na-acha odo odo dị irighiri, onye nchụaja ga-agụ ha dịka ndị na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ nke dị nʼisi maọbụ nʼagba. 31Ma ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, maọbụ na ajị dị nʼebe ahụ adịghị eji ojii, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa. 32Nʼụbọchị nke asaa onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ abasaghị karịa, ọ bụrụ na o nweghị ajị na-acha edo edo, ọ bụrụkwa na o mibaghị emiba, 33ọ ga-akpụchapụ ajị niile dị nʼakụkụ ebe ahụ ọnya mere ya, ma ọ gaghị akpụchapụ ajị dị nʼọnya ahụ nʼonwe ya. Onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa. 34Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ basaghị karịa, maọbụ mibanye nʼime karịa anụ ahụ, a ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha. Ọ ga-apụ sachaa uwe ya, bụrụ onye dị ọcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.