Native Bible

Leviticus 13:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma akpụkpọ anụ ahụ ya anọgide na-acha ọcha, maọbụ na-acha ọbara ọbara, a ga-ejekwuru onye nchụaja ka o lee ya anya nʼahụ.

Leviticus 13:19 in English

Leviticus 13:19 · Berean Standard Bible

and a white swelling or a reddish-white spot develops where the boil was, he must present himself to the priest.

Context

17Onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ọnya niile ahụ na-acha ezi ọcha, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye na-enweghị ntụpọ. Ndị dị ọcha ka ha ga-abụ. 18“Ọ bụrụ na etuto toro mmadụ nʼahụ alaa, 19ma akpụkpọ anụ ahụ ya anọgide na-acha ọcha, maọbụ na-acha ọbara ọbara, a ga-ejekwuru onye nchụaja ka o lee ya anya nʼahụ. 20Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na e nwere ọrịa dị nʼokpuru akpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ajị ya na-acha ọcha, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye rụrụ arụ, nʼihi na ekpenta esitela nʼetuto ahụ pụta. 21Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ajị ọcha adịghị nʼakpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ọnya ahụ abanyeghị nʼime, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.