Native Bible

Leviticus 13:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye nchụaja ga-enyocha ọnya ahụ. Kwupụta na onye ahụ rụrụ arụ. Ọnya ahụ rụrụ arụ nʼihi na ọrịa ekpenta ka ọ bụ.

Leviticus 13:15 in English

Leviticus 13:15 · Berean Standard Bible

When the priest sees the raw flesh, he must pronounce him unclean. The raw flesh is unclean; it is a skin disease.

Context

13onye nchụaja a ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na ọrịa ahụ enupụtala nʼahụ ya niile, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha, ebe ọ bụ na ọrịa ahụ enupụtala mee ka anụ ahụ ya chawa ọcha. 14Ma ọ bụrụ na e nwere akụkụ ahụ ya ọnya ọ hụrụ pụtara, ọ ga-agụ ya dịka onye na-adịghị ọcha. 15Onye nchụaja ga-enyocha ọnya ahụ. Kwupụta na onye ahụ rụrụ arụ. Ọnya ahụ rụrụ arụ nʼihi na ọrịa ekpenta ka ọ bụ. 16Ọ bụrụ nʼọnya ahụ agbanwe na-acha ọcha, ha ga-agakwuru onye nchụaja. 17Onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ọnya niile ahụ na-acha ezi ọcha, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye na-enweghị ntụpọ. Ndị dị ọcha ka ha ga-abụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.