Levitikọs 13:12
Leviticus 13:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na onye nchụaja elee onye ahụ anya hụ na ọrịa ọcha ahụ enupụtala nʼakụkụ ahụ ya niile, site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya,
Leviticus 13:12 in English
Leviticus 13:12 · Berean Standard Bible
But if the skin disease breaks out all over his skin so that it covers all the skin of the infected person from head to foot, as far as the priest can see,
Context
10Onye nchụaja ga-ele anya nʼakụkụ anụ ahụ ya zara aza ịchọpụta ma ọ dị ọcha, ma ajị dị gburugburu ebe ahụ ọ na-acha ọcha, na ịhụkwa ma ọ nwere ọnya dị gburugburu ebe ahụ. 11Ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ihe ndị a, ọ bụ ọrịa ekpenta nʼezie. Ọ ga-agụkwa onye ahụ dịka onye rụrụ arụ. A gaghị edebekwa ya ile ya ahụ, nʼihi na ọ bụrụlarị onye rụrụ arụ. 12“Ọ bụrụ na onye nchụaja elee onye ahụ anya hụ na ọrịa ọcha ahụ enupụtala nʼakụkụ ahụ ya niile, site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, 13onye nchụaja a ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na ọrịa ahụ enupụtala nʼahụ ya niile, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha, ebe ọ bụ na ọrịa ahụ enupụtala mee ka anụ ahụ ya chawa ọcha. 14Ma ọ bụrụ na e nwere akụkụ ahụ ya ọnya ọ hụrụ pụtara, ọ ga-agụ ya dịka onye na-adịghị ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.