Native Bible

Leviticus 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie.

Leviticus 12:6 in English

Leviticus 12:6 · Berean Standard Bible

When the days of her purification are complete, whether for a son or for a daughter, she is to bring to the priest at the entrance to the Tent of Meeting a year-old lamb for a burnt offering and a young pigeon or a turtledove for a sin offering.

Context

4Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ọ ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka ọ dị ọcha gasịrị. 5Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha. 6“ ‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie. 7Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya. “ ‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị. 8Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.