Native Bible

Leviticus 11:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.

Leviticus 11:45 in English

Leviticus 11:45 · Berean Standard Bible

For I am the LORD, who brought you up out of the land of Egypt so that I would be your God; therefore be holy, because I am holy.

Context

43Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha. 44Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka. 45Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ. 46“ ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala. 47Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’ ” 11:3 Ya bụ wara abụọ 11:3 Nke na-ata nri ya ugboro abụọ 11:19 Maọbụ, hoopoe 11:30 Maọbụ, agụ ụlọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.