Levitikọs 11:42
Leviticus 11:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.
Leviticus 11:42 in English
Leviticus 11:42 · Berean Standard Bible
Do not eat any creature that moves along the ground, whether it crawls on its belly or walks on four or more feet; for such creatures are detestable.
Context
40Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri. 41“ ‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha. 42Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ. 43Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha. 44Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.