Native Bible

Leviticus 11:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.

Leviticus 11:39 in English

Leviticus 11:39 · Berean Standard Bible

If an animal that you may eat dies, anyone who touches the carcass will be unclean until evening.

Context

37Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha. 38Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ. 39“ ‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 40Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri. 41“ ‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.