Native Bible

Leviticus 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.”

Leviticus 10:4 in English

Leviticus 10:4 · Berean Standard Bible

Moses summoned Mishael and Elzaphan,* sons of Aaron’s uncle Uzziel, and said to them, “Come here; carry the bodies of your cousins outside the camp, away from the front of the sanctuary.”

Context

2Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị. 3Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.*’ ” Ma Erọn gbara nkịtị. 4Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.” 5Ha bịara ghanye aka nʼuwe ime ahụ ha buru ha bupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, dịka Mosis nyere nʼiwu. 6Mosis tụgharịrị sị Erọn na ụmụ ya, Elieza na Itama, “Unu ekwekwala ka ntutu isi unu kpasaa akpasa izipụta na unu na-eru ụjụ. Unu adọwakwala uwe unu. Nʼihi na ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-anwụ. Iwe Onyenwe anyị ga-abịakwasịkwa ọgbakọ Izrel niile. Ma ndị ikwu gị, ụmụ Izrel ndị ọzọ, nwere ike ruo ụjụ nʼihi Nadab na Abihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.