Native Bible

Leviticus 10:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma unu na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom ka ọ dịkwara iri obi anụ na apata ya, nke e fufere nʼihu Onyenwe anyị. Kama, ọ bụ nʼebe dị ọcha ka unu ga-anọ rie ya. Nke a bụ oke enyere unu na ụmụ unu site nʼaja udo nke ụmụ Izrel.

Leviticus 10:14 in English

Leviticus 10:14 · Berean Standard Bible

And you and your sons and daughters may eat the breast of the wave offering and the thigh of the contribution in a ceremonially clean place, because these portions have been assigned to you and your children from the peace offerings of the sons of Israel.

Context

12Mosis sịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom fọdụrụ, bụ Elieza na Itama, “Werenụ onyinye mkpụrụ ọka nke fọdụrụ site na onyinye nsure ọkụ, nke a kwadoro na-etinyeghị ihe iko achịcha ọbụla, bụ nke e nyere Onyenwe anyị. Rienụ ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼihi na ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 13Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere Onyenwe anyị; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu. 14Ma unu na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom ka ọ dịkwara iri obi anụ na apata ya, nke e fufere nʼihu Onyenwe anyị. Kama, ọ bụ nʼebe dị ọcha ka unu ga-anọ rie ya. Nke a bụ oke enyere unu na ụmụ unu site nʼaja udo nke ụmụ Izrel. 15Apata ụkwụ anụ nke aja mbuli na obi anụ ahụ nke e fufere, ka a ga-eweta ya na abụba ya nye dịka onyinye sitere nʼọkụ. A ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Nke a ga-abụ oke ruuru unu na ụmụ unu mgbe niile, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.” 16Mgbe Mosis jụrụ ajụjụ banyere mkpi ahụ e ji chụọ aja mmehie, ọ chọpụtara na a kpọọla ya ọkụ. O wesoro Elieza na Itama ụmụ ndị ikom Erọn iwe sị ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.