Levitikọs 1:2
Leviticus 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.
Leviticus 1:2 in English
Leviticus 1:2 · Berean Standard Bible
“Speak to the Israelites and tell them: When any of you brings an offering to the LORD, you may bring as your offering an animal from the herd or the flock.
Context
1Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị, 2“Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ. 3“ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ* e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata. 4Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.