Joshua 8:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha,
Joshua 8:5 in English
Joshua 8:5 · Berean Standard Bible
Then I and all the troops with me will advance on the city. When they come out against us as they did the first time, we will flee from them.
Context
3Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị 4o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere. 5Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha, 6Ha ga-achụ anyị ọsọ, tutu ruo mgbe anyị mere ka ha niile hapụ nʼobodo ha pụta. Nʼihi nʼuche ha, ha ga-asị, ‘Ha na-agbara anyị ọsọ dịka ha mere na mbụ, bịanụ ka anyị chụọ ha ọsọ gbuo ha.’ Ya mere, dịka anyị na-agbapụ site nʼebe ha nọ, 7unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ya nʼaka unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.