Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Joshua gụpụtara na ntị ha,* okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya,* dịka ihe niile e dere nʼAkwụkwọ* Iwu si dị.

Joshua 8:34 in English

Joshua 8:34 · Berean Standard Bible

Afterward, Joshua read aloud all the words of the law—the blessings and the curses—according to all that is written in the Book of the Law.

Context

32Ma mgbe ndị Izrel nọ na-ele anya, Joshua depụtara iwu ndị ahụ Mosis nyere ha nʼelu nkume. 33Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu Gerizim, ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu Ebal, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị Izrel. 34Emesịa, Joshua gụpụtara na ntị ha,* okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya,* dịka ihe niile e dere nʼAkwụkwọ* Iwu si dị. 35Iwu niile Mosis nyere ha ka Joshua gụpụtara na ntị ndị Izrel niile. Ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa niile bi nʼetiti ụmụ Izrel so nọkọọ nʼoge a ndị Izrel niile zukọrọ. 8:34 Dit 31:11; Neh 8:3 8:34 Dit 28:2,15,45; 29:20-21; 30:19 8:34 Jos 1:8

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.