Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Joshua kwụbara eze ndị Ai nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, Joshua nyere iwu ka e wedata ozu eze Ai site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.

Joshua 8:29 in English

Joshua 8:29 · Berean Standard Bible

He hung the king of Ai on a tree * until evening, and at sunset Joshua commanded that they take down the body from the tree and throw it down at the entrance of the city gate. And over it they raised a large pile of rocks, which remains to this day.

Context

27Ma ndị Izrel kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Joshua nʼiwu si dị. 28Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa. 29Ma Joshua kwụbara eze ndị Ai nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, Joshua nyere iwu ka e wedata ozu eze Ai site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. 30Mgbe ahụ, Joshua wuuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ebe ịchụ aja nʼelu ugwu Ebal, 31dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ na aja udo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.