Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.”

Joshua 8:2 in English

Joshua 8:2 · Berean Standard Bible

And you shall do to Ai and its king as you did to Jericho and its king, except that you may carry off their plunder and livestock for yourselves. Set up an ambush behind the city.”

Context

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya. 2Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.” 3Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị 4o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.