Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?

Joshua 7:8 in English

Joshua 7:8 · Berean Standard Bible

O Lord, what can I say, now that Israel has turned its back and run from its enemies?

Context

6Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha. 7Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan. 8Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ? 9Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?” 10Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.