Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri,* nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel.

Joshua 7:1 in English

Joshua 7:1 · Berean Standard Bible

The Israelites, however, acted unfaithfully regarding the things devoted to destruction.* Achan * son of Carmi, the son of Zabdi,* the son of Zerah, of the tribe of Judah, took some of what was set apart. So the anger of the LORD burned against the Israelites.

Context

1Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri,* nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel. 2Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai. 3Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.