Joshua 6:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na Onyenwe anyị enyela unu obodo a!
Joshua 6:16 in English
Joshua 6:16 · Berean Standard Bible
After the seventh time around, the priests blew the horns, and Joshua commanded the people, “Shout! For the LORD has given you the city!
Context
14Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii. 15Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. 16O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na Onyenwe anyị enyela unu obodo a! 17Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ. 18Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.