Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.”

Joshua 5:2 in English

Joshua 5:2 · Berean Standard Bible

At that time the LORD said to Joshua, “Make flint knives and circumcise the sons of Israel once again.*”

Context

1Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na Onyenwe anyị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel. 2Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.” 3Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot. 4Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.