Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị*?”

Joshua 5:13 in English

Joshua 5:13 · Berean Standard Bible

Now when Joshua was near Jericho, he looked up and saw a man standing in front of him with a drawn sword in His hand. Joshua approached Him and asked, “Are You for us or for our enemies?”

Context

11Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara. 12Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan. 13Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị*?” 14Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” 15Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya. 5:9 Jos 4:9; 9:6 5:13 Maọbụ, ndị na-emegide anyị

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.