Joshua 4:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
Joshua 4:9 in English
Joshua 4:9 · Berean Standard Bible
Joshua also set up twelve stones in the middle of the Jordan,* in the place where the priests who carried the ark of the covenant stood. And the stones are there to this day.
Context
7Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.” 8Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka Onyenwe anyị si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ. 9Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. 10Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan. 11Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.