Joshua 4:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,
Joshua 4:5 in English
Joshua 4:5 · Berean Standard Bible
and said to them, “Cross over before the ark of the LORD your God into the middle of the Jordan. Each of you is to take a stone upon his shoulder, according to the number of the tribes of Israel,
Context
3ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.” 4Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla, 5Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị, 6ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’ 7Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.