Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu.

Joshua 3:9 in English

Joshua 3:9 · Berean Standard Bible

So Joshua told the Israelites, “Come here and listen to the words of the LORD your God.”

Context

7Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị. 8Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ” 9Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu. 10Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu. 11Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.