Joshua 24:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ.
Joshua 24:7 in English
Joshua 24:7 · Berean Standard Bible
So your fathers cried out to the LORD, and He put darkness between you and the Egyptians, over whom He brought the sea and engulfed them. Your very eyes saw what I did to the Egyptians. Then you lived in the wilderness for a long time.
Context
5“ ‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt. 6Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ. 7Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ. 8“ ‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha. 9Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.