Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt.

Joshua 24:4 in English

Joshua 24:4 · Berean Standard Bible

and to Isaac I gave Jacob and Esau. I gave Esau Mount Seir to possess, but Jacob and his sons went down to Egypt.

Context

2Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe. 3Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik. 4Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt. 5“ ‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt. 6Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.