Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.”

Joshua 24:22 in English

Joshua 24:22 · Berean Standard Bible

Then Joshua told them, “You are witnesses against yourselves that you have chosen to serve the LORD.” “We are witnesses!” they said.

Context

20Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.” 21Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.” 22Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.” 23Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.” 24Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.