Joshua 23:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama raparanụ* nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.
Joshua 23:8 in English
Joshua 23:8 · Berean Standard Bible
Instead, you shall hold fast to the LORD your God, as you have done to this day.
Context
6“Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla. 7Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha. 8Kama raparanụ* nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa. 9“Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu. 10Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.